Esta

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10


Isi 1

O rue, n'ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n'India we rue Etiopia:)
2 na mb͕e ahu, mb͕e eze, bú Ahasuerọs, nọkwasiri n'oche-eze ala-eze-ya, nke di na Shushan, bú ulo uku eze,
3 n'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze-ya, na o mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi-isi-ya na ndi-orù-ya; ndi bu dìnkpà nke Peasia na Midia, bú ndi-eze na ndi-isi nke ala nile anāchi achi, nọ n'iru ya:
4 mb͕e o mere ka ahú àkù nke nsọpuru ala-eze-ya na ọkaka nke ima-nma nke idi-uku-ya ọtutu ubọchi, bú ọgu ubọchi iteghete.
5 Ma mb͕e emezuru ubọchi ndia, eze mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi nile ndi ahuru na Shushan, bú ulo uku eze, site n'onye uku we rue onye ntà, ubọchi asa, n'ogige nke ubi ab͕ara ogige nke ulo eze;
6 ihe-nkwuba di nke ezi ákwà ọcha na ogho ọcha na ogho anunu, nke eji udọ̀ nke ezi ákwà ọcha na ogho ododo kekọta ha na nb͕a-aka ọla-ọcha na ogidi marble: ihe-ndina bu ọla-edo na ọla-ọcha, n'elu pavement eji marble uhie, na nke ọcha, na nke edo, na nke oji, me.
7 Ha me-kwa-ra ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu n'ihe ọla-edo, (ihe nile di kwa iche iche,) manya-vine nke ala-eze ba-kwa-ra uba, dika aka eze ruru.
8 Ọṅuṅu-ihe ahu di ka iwu si di; ọ dighi onye nērugide erugide: n'ihi na otú a ka eze nyere onye uku ọ bula nke ulo-ya iwu, ime dika ọ tọrọ nwoke ọ bula utọ.
9 Vashti, bú nwunye eze, me-kwa-ra ọṅuṅu-manya-vine nye ndinyom n'ulo ala-eze nke eze, bú Ahasuerọs, nwere.
10 N'ubọchi nke-asa, mb͕e obi eze di nma site na manya-vine, ọ siri Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, bú ndi-onozi asa ndi nēje ozi n'iru eze, bú Ahasuerọs,
11 ka ha me ka Vashti, bú nwunye eze, bia n'iru eze nēkpu okpu-eze nke ala-eze, ime ka ndi di iche iche na ndi-isi hu nma-ya: n'ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu.
12 Nwunye eze, bú Vashti, we ju ibia n'okwu eze nke sitere n'aka ndi-onozi: eze we we iwe nke-uku, ọnuma-ya nēre ọku nime ya.
13 Eze we si ndi mara ihe, bú ndi mara mb͕e di iche iche, (n'ihi na otú a ka okwu eze di n'iru ndi nile mara iwu na ikpé;
14 ma onye nọ nso ya bu Kashena, ya na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan, bú ndi-isi asa nke Peasia na Midia, ndi nāhu iru eze, ndi nānọ n'isi n'ala-eze:)
15 Dika iwu si di, gini ka agēme nwunye eze, bú Vashti, n'ihi na o meghi ihe eze, bú Ahasuerọs, siri ya site n'aka ndi-onozi?
16 Memukan we kwue n'iru eze na ndi-isi, si, Ọ bughi eze, nání ya, ka Vashti, bú nwunye eze, mere ajọ omume megide, kama megide ndi-isi nile, megide kwa ndi di iche iche nile ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs.
17 N'ihi na okwu a bayere nwunye eze gāpu rue nti ndinyom nile, ime ka di-ha buru ihe anēleda eleda n'anya-ha, mb͕e ha nāsi, Eze, bú Ahasuerọs, siri ka eme Vashti, bú nwunye eze, ka ọ bia n'iru ya, ma ọ biaghi.
18 Ubọchi ta ka ndinyom ndi-isi nke Peasia na Midia, bú ndi nuworo okwu a bayere nwunye eze, gāsi kwa ndi-isi nile nke eze otú a, nleda-anya na iwe nke zuru ezu gāputa kwa.
19 Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n'iru ya pua, ka ede kwa ya n'akwukwọ n'etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n'iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya.
20 Agēme kwa ka anu iwu eze, bú nke ọ nēme, n'ala-eze-ya nile, (n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu,) ndinyom nile gēnye di-ha nsọpuru, site n'onye uku we rue onye ntà.
21 Okwu ahu we di nma n'anya eze na ndi-isi-ya; eze we me dika okwu Memukan si di:
22 o we ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, n'ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n'ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.