Isi 35

Obi gātọ ọzara na ala kpọrọ nku utọ; ala ihe nādighi gēteghari kwa egwú ọṅù, b͕awa okoko-ọhia, dika rose.
2 Ọ gāb͕awa nke-uku, teghari kwa egwú ọṅù, e, n'iteghari-egwú-ọṅù na n'iti-nkpu-ọṅù; nsọpuru Lebanon ka agēnye ya, e, ima-nma nke Kamel na Sheron: ndia gāhu ebube Jehova, bú ima-nma nke Chineke-ayi.
3 Menu aka kudara akuda ka ha di ike, b͕a-kwa-nu ikperè nāsu ngọngọ ume.
4 Sinu ndi obi-ha nēme ngwa, Dinu ike, unu atula egwu: le, Chineke-unu! ibọ̀-ọ́bọ̀ nābia, bú nkwughachi nke Chineke; Ya onwe-ya gābia zọputa unu.
5 Mb͕e ahu ka agēmeghe anya ndi-ìsì, ọ bu kwa nti nke ndi nti chiri ka agēmeghe.
6 Mb͕e ahu ka onye-ngwurọ gāmali dika ele, ire onye-ob͕i gēti kwa nkpu ọṅù: n'ihi na n'ọzara ka miri nāb͕awaputa, miri-iyi kwa n'ala ihe nādighi.
7 Mirage gāghọ kwa ọdọ-miri, ala miri nādighi gāghọ kwa isi-iyi juputara na miri: n'ebe-obibi nkita-ọhia, ebe ha nāmakpu amakpu, ogige nke diri amì na papyrus.
8 Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.
9 Ọ dighi ọdum gādi n'ebe ahu, ọ dighi kwa anu-ọhia nke di irè gārigo n'elu ya, agaghi-ahu ya n'ebe ahu; ma ndi emeworo ka ha nwe onwe-ha nēje ije n'ebe ahu:
10 ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.