Malakai

1 2 3 4


Isi 1

Ibu okwu Jehova eboro Israel site n'aka Malakai.
2 Ahuwom unu n'anya, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka I huworo ayi n'anya? Isọ, ọ̀ bughi nwa-nne Jekob? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): otú ọ di, anamahu Jekob n'anya;
3 ma Isọ ka M'kpọworo asì, me ugwu-ya nile ka ha ghọ ebe tọḅọrọ n'efu, M'were ihe-nketa-ya nye nkita-ọhia nile nke ọzara.
4 Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.
5 Anya-unu gāhu kwa, unu onwe-unu gāsi kwa, Jehova di uku rue ofè ókè-ala Israel.
6 Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M'bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M'bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?
7 Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n'elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N'isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu.
8 Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
9 Ma uḅu a, biko, menu ka iru Chineke dajua, ka O we mere ayi amara: ọ bu site n'aka-unu ka nka diworo: Ọ̀ gāhu onye ọ bula nime unu iru-ọma? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri:
10 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n'etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n'efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n'aka-unu nke-ọma.
11 N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
12 Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n'isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì.
13 Unu asiwo kwa, Le, ka o si buru oké ike-ọgwugwu! unu afùwo kwa ya na nlelì, ka Jehova nke ndi-agha siri; unu ewebatawo kwa ihe anapuru n'ike, na ihe gwọrọ ngwuro, na nāria ọria; otú a ka unu webataworo onyinye-inata-iru-ọma: #M'gānara nka nke-ọma nāka-unu? ka Jehova siri.
14 Ma onye anābu ọnu ka onye-nghọḅu ahu bu, nke oké di n'ìgwè aturu-ya, ma ọ nēkwe nkwa, we chuara Onye-nwe-ayi àjà ihe biriri ebibi: n'ihi na eze uku ka M'bu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, aham di kwa egwu n'etiti mba nile.