Matiu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28


Isi 1

Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham.
2 Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya;
3 Juda we mua Perez na Zera site na Tema; Perez we mua Hezron; Hezron we mua Ram;
4 Ram we mua Aminadab; Aminadab we mua Nahshon; Nahshon we mua Salmon;
5 Salmon we mua Boaz site na Rehab; Boaz we mua Obed site na Rut; Obed we mua Jesi;
6 Jesi we mua Devid, bú eze. Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia;
7 Solomon we mua Rehoboam; Rehoboam we mua Abaija; Abaija we mua Esa;
8 Esa we mua Jehoshafat; Jehoshafat we mua Joram; Joram we mua Uzaia;
9 Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia;
10 Hezekaia we mua Manase; Manase we mua Emon; Emon we mua Josaia;
11 Josaia we mua Jekonaia na umu-nne-ya, na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon.
12 Mb͕e emesiri ka ha je biri na Babilon, Jekonaia we mua Shealtiel; Shealtiel we mua Zerubabel;
13 Zerubabel we mua Abaiud; Abaiud we mua Elaiakim; Elaiakim we mua Ezoa;
14 Ezoa we mua Sedok; Sedok we mua Akim; Akim we mua Elaiud;
15 Elaiud we mua Eleeza; Eleeza we mua Matan; Matan we mua Jekob;
16 Jekob we mua Josef di Meri, nwanyi nke muru Jisus, Onye anākpọ Kraist.
17 Ya mere ọb͕ọ nile site n'Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ.
18 Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ.
19 Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n'iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo.
20 Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.
21 Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.
22 Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,
23 Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.
24 Josef we si n'ura-ya bilie, me dika mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nyere ya iwu, we kuru nwunye-ya;
25 ọ maghi kwa ya rue mb͕e ọ muputara Nwa-nwoke: o we kpọ aha-Ya Jisus.