Luk

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 1

Ebe ọtutu madu tinyere aka-ha ide akwukwọ banyere ihe ahu nke emezuworo n'etiti ayi,
2 ha dere ihe ndi mbu ji anya ha hu ihe ndia burukwa ndi na-ekwuputa ozioma, gwara ayi,
3 ọ di-kwa-ram nma, ebe m'soro ihe nile nke-ọma site na mbu, ka m'dere gi ka o si me, Teọfilọs di oké ebube;
4 ka i we mata na ihe nile ejiworo okwu ọnu zí gi bu ihe kwesiri itukwasi obi.
5 N'ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n'òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n'etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet.
6 Ha abua bu ndi ezi omume n'iru Chineke, nāga n'ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n'iwu na n'ihe nile Ọ guru n'ihe ziri ezi nādighi ita uta.
7 Ha ejighi kwa nwa, n'ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi.
8 Ma o rue, mb͕e ọ nālu ọlu nchu-àjà n'iru Chineke dika ha si-eme kwa ubochi,
9 dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n'ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n'ife nzà.
10 Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n'èzí n'oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
11 Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n'aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
12 Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri, ọ tu-kwa-ra egwu.
13 Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn.
14 I gēnwe kwa ọṅù na obi-utọ; ọtutu madu gāṅuri kwa ọṅu n'ọmumu-ya.
15 N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya.
16 Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikwute Onye-nwe-ayi Chineke-ha.
17 Ya onwe-ya gāga kwa n'iru Ya nime mọ na ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānughi ihe chigharia iga n'uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ya otù ndi nke akwadebeworo Ya.
18 Zakaraias we si mọ-ozi ahu, Òle ihe m'gēji mara nka? n'ihi na mu onwem bu agadi, nwunyem aghọwo kwa agadi.
19 Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mu onwem bu Gebriel, onye nēguzo n'iru Chineke; ezite-kwa-ram igwa gi okwu, na izì gi ozi ọma ndia.
20 Le kwa, i gēkpuchi ọnu, i gaghi-apu kwa ikwu okwu, rue ubọchi ahu mb͕e ihe ndia gēme, n'ihi na i kweghi okwum ndia, nke gēmezu n'oge-ha.
21 Ndi-Ju we nēle anya Zakaraias, o ju-kwa-ra ha anya n'ebe ọ nānọ ọdù n'ulo nsọ.
22 Ma mb͕e ọ putara, ọ pughi igwa ha okwu: ha we mara na ọ hururi ọhù n'ulo nsọ: ya onwe-ya we nēfere ha aka, nānọgide kwa n'ob͕i.
23 O we rue, mb͕e ubọchi ifè-òfùfè-ya zuru, na ọ lara n'ulo-ya.
24 Ma mb͕e ubọchi ndia gasiri Elizabet nwunye-ya turu ime; o we zobe onwe-ya ọnwa ise, si,
25 Otú a ka Onye-nwe-ayi meworo nyem n'ubochi O ji lem anya, iwepu ita-utam n'etiti madu.
26 Ma n'ọnwa nke isi ezigara mọ-ozi ahu, bú Gebriel, site n'ebe Chineke nọ je obodo nke Galili, anākpọ aha-ya Nazaret,
27 jekuru nwa-ab͕ọghọ nā-maghi nwoke, onye ekwere na otù nwoke si n'ulo Devid puta, onye aha-ya bu Josef, gālu ya; aha nwa-ab͕ọghọ ahu bu Meri.
28 O we bata n'ebe ọ nọ, si, Ekele, gi onye Chineke meworo ka i nara amara, Onye-nwe-ayi nọyere gi.
29 Ma obi lọrọ ya miri nke-uku n'okwu-ya, o we nātule n'uche-ya aha ekele okwu a gābu.
30 Mọ-ozi ahu we si ya, Atula egwu, Meri: n'ihi na Chineke mere gi amara.
31 Le kwa, i gāturu ime, muta Nwa-nwoke, kpọ aha-Ya Jisus.
32 Nwa-nwoke ahu gābu onye uku, agākpọ kwa Ya Ọkpara nke Onye kachasi ihe nile elu: Onye-nwe-ayi Chineke gēnye kwa Ya oche-eze nna-Ya Devid:
33 Ọ gābu kwa eze ulo Jekob rue mb͕e ebighi-ebi; ala-eze-Ya agaghi-agwu kwa agwu.
34 Meri we si mọ-ozi ahu, Ìhe a gēsi aṅa me, ebe ọ dighi nwoke m'mara?
35 Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.
36 Le kwa, Elizabet onye-ikwu-gi, ya onwe-ya aturuwo kwa ime nwa-nwoke n'agadi-ya: nke a bu kwa ọnwa nke-isi ya, bú onye anākpọ nwanyi-àgà.
37 N'ihi na ọ dighi okwu ọ bula si Chineke n'ọnu puta nke nāgaghi-adi irè.
38 Meri we si, Le, abum orù-nwanyi nke Onye-nwe-ayi; ya dirim ka okwu-gi si di. Mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ.
39 Ma Meri biliri na mb͕e ahu, ga elu-ala ọsọsọ, bà n'otù obodo nke Juda;
40 we ba n'ulo Zakaraias, kele kwa Elizabet.
41 O we rue, mb͕e Elizabet nuru ekele Meri, nwa-ya wuliri n'afọ-ya; Elizabet we juputa na Mọ Nsọ;
42 o we welie olu-ya tisie nkpu ike, si, Gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi n'etiti ndinyom, ọ bu kwa onye agọziri agọzi ka nkpuru nke afọ-gi di.
43 Òle ebe ka nka si kwa rum, na nne Onye-nwem gābiakutem?
44 N'ihi na lee, mb͕e olu ekele-gi ruru na ntim, nwam wuliri n'afọm n'obi-utọ.
45 Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n'ọnu Onye-nwe-ayi.
46 Meri we si, Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku,
47 Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam.
48 N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya: N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri.
49 N'ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche; Aha-Ya di kwa nsọ.
50 Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu Ya Rue ọb͕ọ na ọb͕ọ.
51 O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike; Ọ chusawo ndi-npako n'èchìchè nke obi-ha.
52 O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.
53 O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ; Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu.
54 O nyeworo Israel nwa-Ya aka, Ka O we cheta ebere
55 (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà) N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi.
56 Meri we nọyere ya ihe dika ọnwa atọ, we laghachi n'ulo-ya.
57 Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke.
58 Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu.
59 O we rue n'ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n'aha nna-ya.
60 Nne-ya we za, si, mba; kama agākpọ ya Jọn.
61 Ha we si ya, Ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-ikwu-gi nke anākpọ aha nka.
62 Ha we fere nna-ya aka, ihe ọ chọrọ ka akpọ ya.
63 O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya.
64 Ngwa ngwa ọnu-ya we saghe, ire-ya tọpu kwa, o we nēkwu okwu, nāgọzi Chineke.
65 Ndi nile bi ha gburugburu we tua egwu: ewe kwusa okwu ndia nile n'elu-ala Judia dum.
66 Ndi nile nke nuru ha we debe ha n'obi-ha, si, Àha madu gini kwa ka nwatakiri a gābu? N'ihi na aka Onye-nwe-ayi diyere ya.
67 Nna-ya Zakaraias we juputa na Mọ Nsọ, o we bu amuma, si,
68 Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel; N'ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa,
69 O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputa N'ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid
70 (Dika O kwuru site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n'oge mbu),
71 Nzọputa n'aka ndi-iro-ayi, na n'aka ndi nile nākpọ ayi asì;
72 Imere nna-ayi-hà ebere, Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya;
73 Iyí Ọ ṅuru Abraham nna-ayi,
74 Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n'aka ndi-iro-ayi, Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu.
75 N'obi ọcha na ezi omume n'iru Ya ubọchi-ayi nile.
76 Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu: N'ihi na i gāga n'iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile;
77 Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa Nime nb͕aghara nmehie nile ha,
78 N'ihi obi ebere nke Chineke-ayi, Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n'elu gēleta ayi nime ya,
79 Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo.
80 Nwatakiri ahu we nētọ, nēsi kwa ike na mọ-ya, o we nọ n'ọhia rue ubọchi ewere ya gosi Israel.