Ọlu Ndi-Ozi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28


Isi 1

Ederem akwukwọ mbu, Teofilọs, banyere ihe nile Jisus malitere ime na izí,
2 rue ubọchi anara Ya n'elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu:
3 ndi O ji kwa ọtutu uzọ nādighi igọ agọ che Onwe-ya n'iru ha na ndu mb͕e Ọ husiri ahuhu, ebe O mere ka ha nāhu Ya anya n'ogologo ọgu ubọchi abua, O nēkwu kwa ihe nile bayere ala-eze Chineke:
4 mb͕e Ya na ha zukọrọ O we nye ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pua, kama ka ha chere nkwa nke Nna-Ya, nke unu nuru n'ọnum, ka O kwuru:
5 n'ihi na Jọn jiri miri me baptism n'ezie; ma agēji Mọ Nsọ me unu baptism mb͕e ọtutu ubọchi nāgaghi-agabiga site n'ub͕u a.
6 Ya mere mb͕e ha b͕akọrọ, ha jua Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ̀ bu n'oge a ka I nēnyeghachi Israel ala-eze?
7 O we si ha, Ọ bughi ihe diri unu ima oge ma-ọbu ubọchi, nke Nnam debere n'ike nke aka Ya.
8 Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.
9 Mb͕e O kwusiri okwu ndia, mb͕e ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n'anya-ha.
10 Mb͕e ha nēlegide anya n'elu-igwe ka Ọ nāga n'elu, le, ndikom abua we guzo ha nso yiri uwe ọcha;
11 ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n'elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu nọ rigo n'elu-igwe, gābia n'otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n'elu-igwe.
12 Mb͕e ahu ha siri n'ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem.
13 Mb͕e ha batara n'obodo, ha we rigo n'ime-ulo di n'elu ulo, ebe ha nānọ; Pita na Jọn na Jemes na Andru, Filip na Tomas, Batọlọmiu na Matiu, Jemes nwa Alfiọs, na Saimon Zilotis, na Judas nwa Jemes.
14 Ndia nile ji otù obi nọgidesi ike n'ekpere, ha na ndinyom ufọdu, na Meri nne Jisus, na umu-nne-Ya.
15 Na mb͕e ahu Pita we bilie n'etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n'otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi),
16 Umu-nnam, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu, nke Mọ Nsọ kwuru n'oge gara aga site n'ọnu Devid banyere Judas, onye mesiri buru onye-ndù ndi jidere Jisus.
17 N'ihi na aguru ya-ri n'etiti ayi, o we keta òkè-ya n'ije-ozi a.
18 (Ya mere onye a sitere n'ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n'ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa.
19 Ọ we buru ihe ndi nile bi na Jerusalem mara; ya mere eji akpọ iberibe ala ahu Akeldama n'asusu-ha, nke ahu bu, Iberibe ala ọbara.)
20 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ Abù ọma, si, Ka ebe-ulo-ikwū-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Ka onye ọ bula ghara kwa ibi na ya: na, Ka onye di iche nara ya ọlu-nlekọta-ya.
21 Ya mere otù onye nime ndikom ndi soro ayi n'oge nile Onye-nwe-ayi Jisus bàra nime pu kwa n'èzí n'etiti ayi,
22 nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n'ebe ayi nọ rigo n'elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n'ọnwu-Ya.
23 Ha we guzo madu abua, Josef anākpọ Basabas, onye akpọ-kwa-ra Justọs, na Mataias.
24 Ha we kpe ekpere, si, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, Onye mara obi madu nile, gosi ayi onye ahu I rọputara nime madu abua ndia,
25 inara ọnọdu n'ije-ozi na ọlu onye-ozi a, nke Judas jehiere nime ya, ka o we ga n'ebe nke aka ya.
26 Ha we fere ha nzà; nzà ahu we ma Mataias; ewe gua ya nime ndi-ozi iri na otù ahu.