Jemes

1 2 3 4 5


Isi 1

Jemes, orù nke Chineke na nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ebo-ayi iri na abua ndi nọ na Nb͕asa ahu, nēkele unu.
2 Guanu ya n'ọṅù nile, umu-nnam, mb͕e ọ bula unu dabàra n'ọwunwa di iche iche;
3 ebe unu mara na nnwaputa nke okwukwe-unu nāluputa ntachi-obi.
4 Ma ka ntachi-obi luzue ọlu-ya, ka unu we tozue okè dizu kwa nma, buru ndi ọ dighi ihe ọ bula fọduru nke unu nēnweghi.
5 Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.
6 Ma ya riọ n'okwukwe, ghara inwe obi abua: n'ihi na onye nwere obi abua yiri ebili-miri nke oké osimiri mb͕e ifufe nēfeghari ya, anātuli kwa ya elu.
7 N'ihi na, ka madu ahu ghara ichè na ọ gānata ihe ọ bula n'aka Onye-nwe-ayi;
8 ọ bu nwoke nwere uche abua, onye nādighi-eguzo n'otù ebe n'uzọ-ya nile.
9 Ma ka nwa-nna nke nọ n'ọnọdu di ala nya isi n'ọnọdu-ya di elu:
10 ma ka ọgaranya nya isi na emere ya ka ọ la ala: n'ihi na dika uzari ahihia ọ gāgabiga.
11 N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile.
12 Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n'ọnwunwa: n'ihi na mb͕e anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahu, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya.
13 Ka onye ọ bula ghara isi, mb͕e anānwa ya, Anēsite n'aka Chineke anwam: n'ihi na Chineke bu Onye anāpughi iwere ihe ọjọ nwa Ya, Ya onwe-ya adighi-anwa kwa onye ọ bula:
14 kama anānwa onye ọ bula mb͕e agu ihe ọjọ nke aka ya nādọkpufu ya, ewe rafue ya.
15 Mb͕e ahu agua ihe ọjọ ahu, mb͕e ọ tuworo ime, o we muputa nmehie: nmehie ahu, mb͕e o tozuru okè, o we muputa ọnwu.
16 Unu ekwela ka eduhie unu, umu-nnam ndi m'huru n'anya.
17 Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta.
18 N'ihi na O zubere ya O were okwu nke ezi-okwu muputa ayi, ka ayi we buru otù aha nkpurú mbu nke ihe O kère èkè.
19 Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:
20 n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.
21 N'ihi nka tupunu inyi nile na njubiga-ókè nile nke ihe ọjọ, were-kwa-nu nwayọ nara okwu ahu nke akuworo nime unu dika n'ubi, nke puru izọputa nkpuru-obi-unu.
22 Ma ghọnu ndi nēme okwu ahu, unu abu-kwa-la ndi nānu nání, ndi nārafu onwe-unu.
23 N'ihi na asi na onye ọ bula bu onye nānu okwu ahu, ma ọ bughi onye nēme ya, onye ahu yiri nwoke nke nēkiri iru-ya n'enyo, bú iru o nwere mb͕e amuputara ya:
24 n'ihi na o kiriri onwe-ya, ọ puwo kwa, ngwa ngwa o we chezọ aha madu ọ bu.
25 Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya.
26 Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye nēkpere Chineke, mb͕e ọ dighi-akwa ire nke ya nga, kama ọ nāghọ obi-ya aghughọ, okpukpe-Chineke nke onye a bu ihe-efu.
27 Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.