Ihe isi ike


  • Okpokoro utu ọka ahu agwughi, ite manu ahu akọghi kwa, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Elaija.
    I. Ndi-Eze 17:16
  • Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi; I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.
    Job 5:21
  • Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike, Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya. Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri, Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.
    Job 26:8-10
  • Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu, Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà; Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi; N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.
    Abù Ọma 9:9-10
  • Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè: Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ: Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.
    Abù Ọma 37:18,19
  • Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye; Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya, Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.
    Abù Ọma 37:25
  • Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile. N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe, Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri; Mb͕e miri-ya nāb͕a aghara nāsu kwa ufufu, Mb͕e ugwu nile nēme nkpatu site na nbili-elu ya. Selah
    Abù Ọma 46:1-3
  • Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya; Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri: Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah
    Abù Ọma 62:8
  • Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri: Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua.
    Abù Ọma 89:9
  • M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike; I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.
    Abù Ọma 91:2
  • Kari olu nile nke ọtutu miri, Kari ebili-miri nile di ebube nke oké osimiri, Jehova Nke nọ n'ebe di elu di ebube.
    Abù Ọma 93:4
  • Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi; Na ọku inye ìhè n'abali. Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia, O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha. O meghere oké nkume, miri we rùputa; Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri.
    Abù Ọma 105:39-41
  • Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du, Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.
    Abù Ọma 107:29
  • Ulo-ntu gādi kwa ibu ǹdò n'ehihie ipu n'okpom-ọku, na ibu ebe-nb͕abà, na ibu ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo na ipu na miri-ozuzo nile.
    Aisaia 4:6
  • N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.
    Aisaia 25:4
  • Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku.
    Aisaia 43:2
  • N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru:
    Aisaia 44:3
  • Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n'ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya.
    Nehum 1:7
  • Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia nke ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku, Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà? Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi?
    Matiu 6:30, 31
  • O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ, unu ndi okwukwe ntà? Mb͕e ahu O biliri, bara ifufe na oké osimiri ahu nba; oké ndaju we di. Ibobo we nwua ndi ahu n'aru, ha si, Àha madu gini ka Onye a bu, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?
    Matiu 8:26, 27
  • Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.
    Luk 10:19
  • Ònye gēkewapu ayi n'ihu-n'anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha? Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi Gi ka anēme ka ayi nwua ogologo ubọchi dum; Aguru ayi dika aturu ob͕ub͕u. É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya. N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche, ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.
    Ndi Rom 8:35-39
  • anākpab͕u ayi n'akuku nile, ma adighi-akpab͕ubiga ayi ókè; ayi nwere obi abua, ma ayi adighi-enwebiga obi abua ókè; anēsob͕u ayi, ma adighi-arapu nání ayi; anātuda ayi n'ala, ma adighi-ala ayi n'iyì;
    II. Ndi Kọrint 4:8,9
  • Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n'aka Chineke, ka ha we zùa ya n'ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ.
    Nkpugh 12:6