Jenesis
Isi 11
Uwa nile we nwe otù asusu na otù uzọ okwu. 
2 O rue, mb͕e ha buliri ije n'Iru-anyanwu, na ha chọtara ala di lari n'ala Shaina; ha we biri n'ebe ahu. 
3 Ha we sirita ibe-ha, Ngwa, ka ayi kpua brick, kpọ ha ọku nke-ọma. Ha we nwe "brick'' n'ọnọdu nkume, ọ bu kwa bitumen ka ha nwere n'ọnọdu urọ. 
4 Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n'elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n'elu uwa nile. 
5 Jehova we ridata ihu obodo ahu na ulo-elu ahu, nke umu madu wuru. 
6 Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime. 
7 Ngwa, ka ayi rida, ghagbue asusu-ha n'ebe ahu, ka ha we ghara inurita asusu ibe-ha. 
8 Jehova we me ka ha si n'ebe ahu b͕asa n'elu uwa nile: ha we rapu iwu obodo ahu. 
9 N'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n'ihi na n'ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n'ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n'elu uwa nile.
10 Ndia bu usoro-ọmumu Shem. Shem b͕ara ọgu arọ ise, mua Apakshad arọ abua ka iju-miri ahu gasiri: 
11 Shem di ndu, mb͕e ọ musiri Apakshad, nnù arọ na ọgu ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
12 Apakshad di ndu orú arọ na iri na ise, mua Shela: 
13 Apakshad di ndu, mb͕e ọ musiri Shela, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
14 Shela di ndu orú arọ na iri, mua Iba: 
15 Shela di ndu, mb͕e ọ musiri Iba, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
16 Iba di ndu orú arọ na iri na anọ, mua Peleg: 
17 Iba di ndu, mb͕e ọ musiri Peleg, nnù arọ na orú na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
18 Peleg di ndu orú arọ na iri, mua Reu: 
19 Peleg di ndu, mb͕e ọ musiri Reu, ọgu arọ iri na arọ iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
20 Reu di ndu orú arọ na iri na abua, mua Serug: 
21 Reu di ndu, mb͕e ọ musiri Serug, ọgu arọ iri na arọ asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
22 Serug di ndu orú arọ na iri, mua Nehoa: 
23 Serug di ndu, mb͕e ọ musiri Nehoa, ọgu arọ iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
24 Nehoa di ndu orú arọ na iteghete, mua Tira: 
25 Nehoa di ndu, mb͕e ọ musiri Tira, ọgu arọ ise na iri na iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
26 Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran.
27 Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot. 
28 Heran we nwua n'iru nna-ya Tira n'ala amuru ya, n'Ua nke ndi Kaldea. 
29 Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska. 
30 Ma Serai bu nwayi-àgà; ọ dighi nwa ọ nwere. 
31 Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n'Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n'ebe ahu. 
32 Ubọchi nile nke Tira we buru ọgu arọ iri na arọ ise: Tira we nwua nime Heran.