Jenesis

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50


Isi 20

Abraham we si n'ebe ahu bulie ije n'uzọ ala Negeb, biri n'etiti Kedesh na Shua; ọ we nọ dika ọbìa nime Gera.
2 Abraham we kwue okwu bayere Sera, bú nwunye-ya, si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: Abimelek, bú eze Gera, we zìe ozi, kuru Sera.
3 Ma Chineke biakutere Abimelek na nrọ nke abali, si ya, Le, gi bu onye nwuru anwu, n'ihi nwayi ahu nke i kuruworo; n'ihi na nwayi ahu bu nwunye di luru.
4 Ma Abimelek akābiaghi nso ya: ọ we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu kwa mba nke nēme ezi omume ka I gēb͕u?
5 Ọ̀ bughi nwoke ahu sirim, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? nwayi ahu kwa, ọbuná ya onwe-ya siri, Nwa-nnem nwoke ka ọ bu: n'izu-okè nke obim na n'emeghi-ihe-ọjọ nke ọbu-akam abua ka m'meworo nka.
6 Chineke we si ya nime nrọ ahu, Mu onwem kwa, amawom na ọ bu n'izu-okè nke obi-gi ka i meworo nka, Mu onwem we b͕ochi kwa gi ka i ghara ime-hie megidem: n'ihi ya ekweghm i metu ya aka.
7 Ma ub͕u a me ka nwunye nwoke ahu laghachi; n'ihi na onye-amuma ka ọ bu, ọ gēkpe kwa ekpere bayere gi, i we di ndu: ma ọ buru na i meghi ka ọ laghachi, gi mata na i ghaghi inwu anwu, gi onwe gi, n'ihe nile inwere.
8 Abimelek we bilie n'isi-ututu, kpọ ndi-orù-ya nile, kwue okwu ndia nile na nti-ha: ndikom ahu we tua egwu nke-uku.
9 Abimelek we kpọ Abraham, si ya, Gini bu ihe i meworo ayi? gini bu kwa ihe m'mehie-woro megide gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasim, biakwasi kwa ala-ezem? omume nke nēkwesighi ime ka imeworo m.
10 Abimelek si kwa Abraham, Gini ka i huru, na i mewo ihe a?
11 Abraham we si, N'ihi na asirim, N'ezie ọ dighi egwù Chineke di n'ebe a; ha gēb͕ukwam n'ihi okwu bayere nwunyem.
12 Ọzọ kwa, ọ bu nwa-nnem nwayi n'ezie, nwa-nwayi nnam ka ọ bu, ọ bu nání na ọ bughi nwa-nwayi nnem; ọ we ghọrọm nwunye:
13 o rue, mb͕e Chineke merem ka m'si n'ulo nnam waghari, na asirim ya, Nka bu ebere-gi nke i gēmerem; n'ebe nile ọ bula nke ayi gābiaru ebe ahu, gi kwue okwu bayerem, si, Nwa-nnem nwoke ka ọ bu.
14 Abimelek we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, nye Abraham, me kwa ka Sera nwunye-ya laghachikute ya.
15 Abimelek we si, Le, alam di n'iru gi: biri n'ebe di nma n'anya-gi.
16 Ọ si Sera, Le, enyewom nwa-nne-gi nnù nkpuru-ego ọla-ọcha abua na ọgu iri: le, nke ahu buru gi ihe-nkpuchi anya n'ebe ndi nile nọ, bú ndi gi na ha nọ; ọ bu kwa n'iru madu nile ka emeziworo gi.
17 Abraham we kpere Chineke: Chineke we me ka aru di Abimelek na nwunye-ya na orù-ya ndinyom nma; ha we mua umu.
18 N'ihi na Jehova b͕ochisiri àkpà-nwa nile nke ulo Abimelek ike, n'ihi okwu bayere Sera, bú nwunye Abraham.