Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 15

Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2 Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za? Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n'ifufe Iru-anyanwu?
3 Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n'ihe ru uka, Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?
4 E, gi onwe-gi nēmebi egwu, Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.
5 N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe, I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.
6 Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem; Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.
7 Ì bu madu mbu amuru? Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?
8 Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti? Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?
9 Gini ka i mara nke ayi nāmaghi? Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?
10 Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi, Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.
11 Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà, Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?
12 Gini mere obi-gi ji ebupu gi? Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?
13 Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke, We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.
14 Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi, Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?
15 Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi; Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.
16 Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya, Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?
17 M'gēkwuputara gi, gem nti; Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:
18 (Nke ndi mara ihe nēgosi Site na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;
19 Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala, Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)
20 Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali, Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.
21 Olu oké egwu di na nti-ya abua; Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:
22 Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata, Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:
23 Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di? Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:
24 Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku; Ha nwere ike n'aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha:
25 N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke, Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;
26 Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya, Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:
27 Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya, Me ka abuba nke di arọ́ di n'úkwù-ya;
28 O we biri n'obodo ezopuru n'uwa, Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha, Nke ejikereworo ighọ obo-ihe.
29 Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike, Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n'uwa.
30 Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya; Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku, Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.
31 Ka ọ ghara ikwere n'ihe-efu, eduhiewo ya: N'ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.
32 Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya, Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu.
33 Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine, Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.
34 N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa, Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.
35 Ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe, Afọ-ha nēdozi kwa aghughọ.