Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 39

Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa? Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa?
2 Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu? Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa?
3 Ha nēruru ala, muputa umu-ha, Tuzuga ihe-nb͕u-ha.
4 Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia; Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha.
5 Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya? Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?
6 Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya, Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya.
7 Ọ nāchì ùzù obodo ọchì, Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike.
8 Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya, Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.
9 Àtu gēkwe ibu orù-gi? Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi?
10 Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi? Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?
11 Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne? Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?
12 Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi, Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?
13 Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu; Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?
14 N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala, Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,
15 O we chezọ na ukwu gāzọpia ha, Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.
16 O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere: Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;
17 N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe, O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.
18 Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ, Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.
19 Ì nēnye inyinya idi-ike-ya? Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?
20 Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube? Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.
21 Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya: Ọ nāpu izute ihe-agha.
22 Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ; Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu.
23 Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya, Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.
24 Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala; Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.
25 Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe! Ọ bu kwa site n'ebe di anya ka ọ nānu ísì agha, Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu.
26 Ọ̀ bu site na nghọta-gi ka eb͕é nēfego n'elu, B͕asa kwa nkù-ya n'ebe Ndida di?
27 Ọ̀ bu n'okwu-ọnu-gi ka ugo nēfeli elu, Ma-ọbu me akwu-ya ka ọ di elu?
28 N'elu nkume di elu ka o nēbi, nọ kwa ọnọdu-abali, N'elu ọnu nkume di elu na ebe ewusiri ike.
29 Site n'ebe ahu ka o nyoputaworo ihe-oriri; Anya-ya abua nēsi n'ebe di anya legide ya.
30 Umu-ya nāmicha kwa ọbara: Ọzọ, ebe ndi eb͕uru eb͕u di, n'ebe ahu ka ọ nọ.