Abụ Ọma 20

Jehova za gi n'ubọchi nkpà, Aha Chineke nke Jekob me ka i nọ n'elu;
2 Si n'ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi, Si kwa na Zaion kwagide gi;
3 Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma, Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba; Selah
4 Ya nye gi dika obi-gi si acho, Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.
5 Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi, Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu: Jehova mezue aririọ-gi nile.
6 Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu; O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-Ya Za ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.
7 Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.
8 Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada: Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.
9 Jehova, zọputa eze: Ya za ayi n'ubọchi ayi kpọkuru Ya.