Abụ Ọma 29

Nyenu Jehova, unu umu Chineke, Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
2 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya; Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.
3 Olu Jehova di n'elu miri: Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe, Jehova nọ n'elu ọtutu miri.
4 Olu Jehova nāda n'ike; Olu Jehova nāda n'ima-nma.
5 Olu Jehova nētiwa osisi cedar; Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.
6 Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi; Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.
7 Olu Jehova nāwaputa ire ọku.
8 Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu; Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.
9 Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele, Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia: Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube.
10 Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu; Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi.
11 Jehova gēnye ndi-Ya ike; Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.