I. Ihe Emere
Isi 15
Devid we mere onwe-ya ulo ufọdu n'obodo Devid; o we doziere ib͕e Chineke ọnọdu, we mara ya ulo-ikwū. 
2 Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n'ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi. 
3 Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya. 
4 Devid we chikọta umu Eron na ndi Livai: 
5 nke umu Kohat; Uriel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi: 
6 nke umu Merari; Asaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri-na-otù: 
7 nke umu Giashom; Joel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi na iri: 
8 nke umu Elizafan; Shemaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri: 
9 nke umu Hebron; Eliel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom anọ: 
10 nke umu Uziel; Aminadab, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom ise na iri na abua. 
11 Devid we kpọ Zedok, kpọ kwa Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, kpọ kwa ndi Livai, bú Uriel, na Asaia, na Joel, na Shemaia, na Eliel, na Aminadab, 
12 si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m'doziri nye ya. 
13 N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n'ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n'ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di. 
14 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we do onwe-ha nsọ ibugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel. 
15 Umu ndi Livai we were nkpa-n'aka-ya abua būru ib͕e Chineke n'ubu-ha n'elu ha, dika Moses nyere iwu, dika okwu Jehova si di. 
16 Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù. 
17 Ndi Livai we guzo Himan nwa Joel; na site n'umu-nne-ya, Esaf nwa Berekaia; na site n'umu Merari, bú umu-nne-ha, Itan nwa Kushaia; 
18 tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama. 
19 Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha; 
20 na Zekaraia, na Aziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Maaseia, na Benaia, chiri une nke dabàra n'olu umu-ab͕ọghọ; 
21 na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, na Azazaia, chiri ubọ-akwara nke dabàra n'octave, ibu ndi-isi nke ndi-abù. 
22 Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n'ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n'ibū ibu ahu, n'ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu. 
23 Berekaia na Elkena bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu. 
24 Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n'iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu. 
25 Devid, na ndi-okenye Israel, na ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, we nēje iwere ọṅù si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova: 
26 o rue, mb͕e Chineke yere ndi Livai ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova aka, na ha churu oke-ehi asa na ebulu asa n'àjà. 
27 Ewere kwa uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha ke Devid ekike, ya na ndi Livai nile ndi nēbu ib͕e ahu, na ndi-ọbù-abù, na Kenania, bú onye-isi n'ibū ibu ahu tiyere ndi-ọbù-abù: ephod ákwà ọcha di kwa n'aru Devid. 
28 Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, chiri kwa opì, na ájà, nēbugota ibe ọb͕ub͕a-ndu Jehova, nēwere une na ubọ-akwara me ka anu udà-ha. 
29 O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova biaruru obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēgwu kwa egwú; o we leda ya anya n'obi-ya.