I. Ihe Emere

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29


Isi 16

Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Chineke.
2 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova.
3 Ọ we kesara madu ọ bula n'Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.
4 O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:
5 ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;
6 Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.
7 Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.
8 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.
9 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.
10 Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya: Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.
11 Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile.
12 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo; Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;
13 Unu nkpuru Israel, bú orù-Ya, Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.
14 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi: N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.
15 Chetanu ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;
16 Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara, Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;
17 O we me ka o guzoro Jekob ibu ukpuru, Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:
18 Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean, Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:
19 Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole; E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;
20 Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ, Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.
21 O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;
22 Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejo-kwa-la ndi-amumam.
23 Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile; Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.
24 Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile, Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
25 N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku: Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.
26 N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: Ma Jehova mere elu-igwe.
27 Ebube na ima-nma di n'iru Ya: Ike na ọṅù di n'ebe-Ya.
28 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche, Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
29 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya: Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya: Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.
30 Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.
31 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù; Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze.
32 Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya; Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;
33 Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova, N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.
34 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
35 Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi, Chikọta kwa ayi, naputa ayi n'aka mba nile, Ikele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi.
36 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.
37 O we rapu n'ebe ahu, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n'iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n'ubọchi-ya si di:
38 na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama:
39 na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n'iru ebe-obibi Jehova n'ebe di elu nke di na Gibeon,
40 isurere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n'ututu na n'anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n'iwu Jehova, nke O nyere Israel n'iwu;
41 ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;
42 ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama.
43 Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.