I. Ihe Emere

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29


Isi 25

Devid na ndi-isi usu-ndi-agha we kewaputara òfùfè ufọdu nime umu Esaf, na nke Himan, na nke Jedutun, ndi nēwere ubọ-akwara, na une, na ájà, bu amuma: ọnu-ọgugu-ha, bú ndikom nēje ozi dika òfùfè-ha si di, we di:
2 nke umu ndikom Esaf; Zakua, na Josef, na Netanaia, na Asharela, bú umu Esaf; ha nọ n'aka Esaf, onye nēbu amuma n'aka eze.
3 Nke Jedutun: umu-ndikom Jedutun; Gedalaia, na Zeri, na Jeshaia, na Hashabaia, na Matitaia, isi; ha nọ n'aka nna-ha, bú Jedutun, onye nēwere ubọ-akwara bu amuma bayere ikele na ito Jehova.
4 Nke Himan: umu-ndikom Himan; Bukia, na Matanaia, na Uziel, na Shebuel, na Jerimot, na Hananaia, na Hanani, na Eliata, na Gidalti, na Romamti-eza, na Joshbekasha, na Maloti, na Hotia, na Mahaziot:
5 ndia nile bu umu-ndikom Himan, bú onye-ọhu-uzọ eze n'okwu Chineke, iweli mpi elu. Chineke we nye Himan umu-ndikom iri na anọ na umu-ndinyom atọ.
6 Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.
7 Ọnu-ọgugu-ha, tiyere umu-nne-ha, ndi ezíworo abù anābùku Jehova, bú ndi nile nwere nghọta, di ọgu iri-na-anọ na asatọ.
8 Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n'otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe.
9 Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:
10 nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
11 nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
12 nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
13 nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
14 nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
15 nke-asatọ mara Jeshaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
16 nke-iteghete mara Matanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
17 nke-iri mara Shimai, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
18 nke-iri-na-otù mara Azarel, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
19 nke-iri-na-abua mara Hashabaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
20 n'ife-nzà nke-iri-na-atọ ọ mara Shubael, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
21 nime nke-iri-na-anọ ọ mara Matitaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
22 nime nke-iri-na-ise ọ mara Jeremot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
23 nime nke-iri-na-isi ọ mara Hananaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
24 nime nke-iri-na-asa ọ mara Joshbekasha, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
25 nime nke-iri-na-asatọ ọ mara Hanani, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
26 nime nke-iri-na-iteghete ọ mara Maloti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-abua:
27 nime nke-orú ọ mara Eliata, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
28 nime nke-orú-na-otù ọ mara Hotia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
29 nime nke-orú-na-abua ọ mara Gidalti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
30 nime nke-orú-na-atọ ọ mara Mahaziot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
31 nime nke-orú-na-anọ ọ mara Romamti-eza, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua.