Ilu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 12

Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya: Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.
2 Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ: Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.
3 Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.
4 Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya: Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.
5 Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé: Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.
6 Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara: Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.
7 Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.
8 Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.
9 Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù, Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.
10 Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya: Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.
11 Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.
12 Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.
13 Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.
14 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe: Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.
15 Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya: Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.
16 Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya: Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.
17 Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume, Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.
18 O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.
19 Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi: Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.
20 Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ: Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.
21 Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume: Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ.
22 Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu: Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.
23 Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.
24 Aka ndi di nkọ gāchi achi: Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.
25 Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.
26 Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.
27 Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá: Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.
28 N'uzọ ezi omume ka ndu di; Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.