Ilu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 19

Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.
2 Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma; Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ.
3 Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru; Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku.
4 Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì: Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n'ebe eyì-ya nọ.
5 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume agaghi-ewepuga onwe-ya.
6 Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua: Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.
7 Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n'ebe di anya kari! Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe.
8 Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n'anya: Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe.
9 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì.
10 Idi-pekepeke amaghi onye-nzuzu nma; Ò gēsi kwa aṅa ma orù nma ichi ndi-isi?
11 Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.
12 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu; Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.
13 Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu: Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.
14 Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu: Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka.
15 Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.
16 Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya: Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.
17 Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.
18 Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.
19 Onye oké ọnuma ganāra nra: N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.
20 Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti, Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.
21 Ọtutu èchìchè di n'obi madu; Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.
22 Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya: Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.
23 Egwu Jehova nēdubà na ndu: Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju; Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.
24 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa, Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya.
25 Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche: Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.
26 Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga, Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.
27 Nwam, rapu inu idọ-aka-na-nti Nke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.
28 Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò: Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe.
29 Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche, Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.