Ilu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 21

Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova: N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.
2 Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua: Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.
3 Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.
4 Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.
5 Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù: Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.
6 Ikpa àkù site n'ire okwu-ugha Bu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.
7 Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha; N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe.
8 Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu: Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.
9 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.
10 Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike: Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.
11 Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe: Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.
12 Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu; Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.
13 Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike, Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.
14 Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe, Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.
15 Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe; Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.
16 Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu, Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.
17 Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu: Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.
18 Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu; Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.
19 Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara, Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.
20 Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe; Ma madu nzuzu nēloda ya.
21 Onye nāb͕aso ezi omume na ebere Nāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.
22 Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo, O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.
23 Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya Nēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.
24 Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.
25 Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua; N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.
26 Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku: Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.
27 Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú: O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?
28 Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì: Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.
29 Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike: Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.
30 Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.
31 Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha: Ma Jehova nwe nzọputa.