Ilu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 5

Nwam, ṅa nti n'amam-ihem; Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam:
2 Ka i we debe ìzùzù di iche iche, Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma.
3 N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu, Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa:
4 Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood, Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua.
5 Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu; Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike;
6 Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari: Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.
7 Ma ub͕u a, umum, gēnum nti, Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu.
8 Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ, Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:
9 Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi, Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile:
10 Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi; Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi;
11 I we sua udè n'ikpe-azu-gi, Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,
12 I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku, Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;
13 Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim, Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala!
14 Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nile N'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.
15 Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi, Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.
16 Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí? Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi?
17 Ka ha diri nání gi onwe-gi, Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.
18 Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.
19 Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma, Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile; Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.
20 Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam? N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?
21 N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di, Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.
22 Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu, Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.
23 Onye ahu gānwu nānaraghi idọ-aka-na-nti; Ọ bu kwa n'iba-uba nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ka ọ nāwaghari.