Ilu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 8

Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù? Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà?
2 N'elu ebe nile di elu n'akuku uzọ, N'ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya;
3 N'akuku ọnu-uzọ-ama nile, n'ọnu amá obodo, Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si,
4 Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku; Olum nādaku kwa umu madu.
5 Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche; Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe.
6 Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu; Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi.
7 N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche; Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu.
8 N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di; Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha.
9 Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ, Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.
10 Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha; Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa.
11 N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby; Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.
12 Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim, Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa.
13 Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.
14 Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe: Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike.
15 Mu ka ndi-eze ji abu eze, Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.
16 Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi, Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa.
17 Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya; Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.
18 Àkù na nsọpuru di n'akam; E, àkù nke nādigide na ezi omume.
19 Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha; Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.
20 N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije, N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:
21 Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi, Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.
22 Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya, Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.
23 Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu, Tutu uwa adi.
24 Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram; Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.
25 Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala, Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram:
26 Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo, Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.
27 Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ: Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri:
28 Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu: Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike:
29 Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya, Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya: Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:
30 Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà: M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi, Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile;
31 Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya; Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ.
32 Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.
33 Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe, Unu eze-kwa-la ya ndu.
34 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu, N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi, Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.
35 N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.
36 Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike: Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n'anya.