Ilu

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 23

Mb͕e i soro onye nāchi achi iri nri, Ghọta nke-ọma onye ahu nke nọ n'iru gi;
2 Tukwasi kwa mma n'akpiri-gi, Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu.
3 Achọsila nri utọ ya ike; Ebe nri ahu bu nri okwu-ugha.
4 Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya; Site na nghọta-gi ra ya aka.
5 Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa: N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe.
6 Erila nri nke onye nwere anya ọjọ, Achọsi-kwa-la nri utọ ya ike:
7 N'ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di: Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n'ebe i nọ.
8 Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa, Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi.
9 Ekwula okwu na nti onye-nzuzu; N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.
10 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi; Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei:
11 N'ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike; Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi.
12 Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti, Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma.
13 Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata: Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu.
14 Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya, We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ.
15 Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe, Obim gāṅuri, ọbuná nkem:
16 Akurum abua gāwuli kwa n'ọṅù, Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi.
17 Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo: Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.
18 N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi; Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
19 Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe, Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ.
20 Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè; N'etiti ndi nēribiga anu ókè:
21 N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile: Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.
22 Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti, Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.
23 Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya; E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.
24 Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku: Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.
25 Ka nna-gi na nne-gi ṅuria, Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
26 Nwam, nyem obi-gi, Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.
27 N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu; Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.
28 E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe, Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.
29 Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu? Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu? Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?
30 Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e; Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa.
31 Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara, Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko, Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:
32 N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta, Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.
33 Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi, Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu.
34 I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri, Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ.
35 Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria; Ha apiawom ihe, amaghm: Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.